2 Ihe E Mere 20:7 - Bible Nso7 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke-ayi, napuru ndi bi n'ala nka ala-ha n'iru ndi-Gi, bú Israel, were ya nye nkpuru Abraham, bú onye nāhu Gi n'anya, rue mb͕e ebighi-ebi? Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 O Chineke anyị, ọ bụghị gị onwe gị chụpụrụ ndị bi nʼala, site nʼihu ndị gị Izrel, were ya nye ụmụ ụmụ Ebraham, bụ enyi gị nwoke? Faic an caibideil |
Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.