Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 20:6 - Bible Nso

6 ọ si, Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Chineke n'elu-igwe? ọ̀ bughi Gi onwe-gi nāchi kwa ala-eze nile nke mba nile? ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di, ọ dighi kwa onye gēguzo onwe-ya n'ebe I nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 sị; “O Onyenwe anyị, Chineke nna nna anyị ha, ọ bụghị gị bụ Chineke onye bi nʼeluigwe? Ọ bụkwa gị na-achị alaeze niile nke mba dị iche iche. Ike na ume dị nʼaka gị, ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzogide gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 20:6
31 Iomraidhean Croise  

ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe di n'elu, ma-ọbu n'elu uwa di n'okpuru; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi:


Ge kwa nti aririọ-amara orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n'ebe ebe a di: Gi onwe-gi nuru kwa n'ebe obibi-Gi, n'elu-igwe; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara.


Jehova, Chineke nke Abraham na Aisak na Israel, bú nna-ayi-hà, debe nka nime nchèputa nke èchìchè nile nke obi ndi-Gi rue mb͕e ebighi-ebi, me kwa ka obi-ha guzosie ike n'ebe I nọ:


Jehoshafat we guzo nime nkpọkọta Juda na Jerusalem, n'ulo Jehova, n'iru ogige ọhu;


Otú ọ di, gi onwe-gi bia, me ihe, di ike ibu agha: Chineke gēme ka i ghara iso ngọngọ n'iru onye-iro-gi; n'ihi na ike di nime Chineke iye aka na ime ka asu ngọngọ.


ndi-nchu-àjà we ghara inwe ike iguzo ije ozi n'ihi igwe-oji ahu: n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Chineke.


ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe, ma-ọbu n'uwa; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi:


O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?


Ma Chineke-ayi nọ n'elu-igwe: Ihe nile nke tọrọ Ya utọ ka O meworo.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah


N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu; Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile.


Chineke aghọwo eze mba nile: Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya.


Chineke, were aha-Gi zọputam, Were kwa idi-ike-Gi kpem ikpe.


Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu, Ub͕ò abua ka m'nuworo nka; Na ike nile bu ihe Chineke nwere:


Ọ si kwa, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Moses we zobe iru-ya; n'ihi na ọ nātu egwu ilegide Chineke anya.


N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo; ònye gēmebi kwa ya? aka-Ya esetiwo kwa; ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu.


Otú a ka jehova siri, Elu-igwe bu oche-ezem, uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwum: àha ulo gini ka unu gēwurum? ma-ọbu àha ebe gini gābu ebe-izu-ikem?


Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka o si n'aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?


N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya.


ọ bu kwa gi ka agāchupu n'ebe madu bi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe ganēde kwa gi, oge asa gāgabiga n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ inye ya ka Ọ gēnye ya.


Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.


Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n'elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ.


Ya mere ọ buru na Chineke nyere ha onyinye ra ka nke O nye-kwa-ra ayi, mb͕e ayi kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Mù onwem bu onye ipu ib͕ochi Chineke?


Ya mere i gāsim, Gini mere Ọ nọ nāta uta? N'ihi na ọ̀ bu onye nēguzogide ihe O zubere?


I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu na n'elu uwa di n'okpuru: ọ dighi onye ọzọ.


Ma mb͕e ayi nuru ya, obi-ayi we lọ ayi miri, ọ dighi kwa mọ guzoro ọzọ nime nwoke ọ bula, n'ihi unu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu, na n'elu uwa di n'okpuru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan