Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 20:23 - Bible Nso

23 Umu Amon na Moab we guzo imegide ndi bi n'ugwu Sia, iwezuga ha ka ebibie ha na ikpochapu ha: mb͕e ha mere ka ndi bi na Sia gwusia, ha we yere onwe-ha aka, nwoke na ibe-ya, ibibi onwe-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ma ndị agha Amọn na Moab buru ụzọ lụso ndị agha si nʼugwu Sia ọgụ. Mgbe ha lakwara onwe ha nʼiyi, ọgụ dakwara nʼetiti ndị Moab na Amọn.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 20:23
12 Iomraidhean Croise  

na ndi Hoa n'ugwu-ha, bú Sia, rue El-peran, nke di n'akuku ọzara.


Juda we biarue ulo-nche, rue ọzara, ha we le ìgwè madu ahu anya; ma, le, ha bu ozu ozu daworo n'ala, ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu.


N'ubọchi-ya ka Edom siri n'okpuru aka Juda jehie, mere onwe-ha eze.


M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze.


M'gākpọ kwa mma-agha ka ọ dakwasi ya n'ugwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): mma-agha onye ọ bula ganēmegide nwa-nne-ya.


M'gākwatu kwa oche-eze nke ala-eze nile, M'gēkpochapu kwa ike nke ala-eze nile nke mba nile; M'gākwatu kwa ub͕ọ-ala, na ndi nānọkwasi ha; inyinya na ndi nānọkwasi ha gārida kwa, onye ọ bula site na mma-agha nwa-nne-ya.


unu alusola ha ọ̀gù; n'ihi na M'gaghi-enye unu ala sitere n'ala-ha, ọbuná rue ebe nzọkwasi ọbu-ukwu-unu: n'ihi na ọ bu Isọ ka M'nyeworo ugwu Sia, ka ọ buru ihe-nnweta.


M'we nye Aisak Jekob na Isọ: M'we nye Isọ ugwu Sia, ka ọ nweta ya; ma Jekob na umu-ya ridara n'Ijipt.


Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n'aru ibe-ya, na n'aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n'uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n'akuku Tabat.


Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n'agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan