Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 20:11 - Bible Nso

11 ma, le, otú ndi ahu nēnyeghachi ayi, n'ibia ichupu ayi n'ihe-nnweta-Gi, nke I meworo ka ayi nweta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Lee ihe ha ji akwụ anyị ụgwọ bụ ịchọ ka ha chụpụ anyị nʼala a i nyere anyị ka ọ bụrụ ihe nketa anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 20:11
12 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu.


Ndi ahu siri n'obodo pua, ha erughi n'ebe di anya, ma Josef siri onye bu onye-isi ulo-ya, Bilie, chua ndikom ahu; mb͕e i ruru ha aru i gāsi ha, N'ìhi gini ka unu were ihe ọjọ kwughachi n'ọnọdu ezi ihe?


Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n'ihi na ike adighi nime ayi n'iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.


Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.


Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ; (Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)


Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.


Àgākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe? n'ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m'guzoro n'iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n'aru ha laghachi.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Edom, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o jiri mma-agha chu nwa-nne-ya, o bibi-kwa-ra obi-ebere-ya nile, iwe-ya we nādọka rue mb͕e ebighi-ebi, ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya, o debewo ya mb͕e ebighi-ebi:


ka O we napu mba uku di kwa ike kari gi ala-ha n'iru gi, ime ka i ba, ka O we nye gi ala-ha ibu ihe-nketa, otú ọ di ta.


Idi ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka ndi nka keta ala ahu nke M'ṅuru nna-ha iyi inye ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan