Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 2:5 - Bible Nso

5 Ma ulo nke mu onwem nēwu di uku, n'ihi na Chineke-ayi di uku kari chi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 “Ụlọnsọ m ga-ewu ga-adị ukwuu nʼihi na Chineke anyị dị ukwuu karịa chi ndị ọzọ niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 2:5
18 Iomraidhean Croise  

Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbi n'elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m'wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi?


ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāma ọsọ; ha gāsi kwa, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a?


N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku: Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile.


Devid, bú eze, we si nkpọkọta Israel nile, Solomon nwam, onye Chineke rọputaworo nání ya, bu nwata, ọ di kwa nrò, ma ije-ozi a di uku: n'ihi na ọ bughi madu ka ulo uku a diri, kama ọ bu Jehova, bú Chineke.


Ma ònye ka mu onwem bu, òle ndi ka ndim bu kwa, na ayi nwere ike iwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ayi otú a? n'ihi na n'ebe I nọ ka ihe nile si bia, ọ bu kwa ihe si n'aka-Gi bia ka ayi nyere Gi.


ọbuná idozirim osisi n'uba: n'ihi na ulo ahu nke mu onwem nēwu gādi uku di kwa ebube.


Umum, ub͕u a unu ejehiela: n'ihi na ọ bu unu ka Jehova rọputara iguzo n'iru Ya, ijere Ya ozi, na iburu Ya ndi nēje ozi na ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbiyere madu n'elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m'wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi?


N'ihi na mu onwem amawo na Jehova di uku, Onye-nwe-ayi di kwa elu kari chi nile.


Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku; Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya.


Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe, Na miri nke di n'elu elu-igwe.


Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova? Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ? Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.


Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha.


Otú a ka jehova siri, Elu-igwe bu oche-ezem, uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwum: àha ulo gini ka unu gēwurum? ma-ọbu àha ebe gini gābu ebe-izu-ikem?


Ọ dighi nke di ka Gi ma-ọli, Jehova; Onye uku ka I bu, ihe di uku ka aha-Gi di kwa n'idi-ike.


Ma ima-nma nke ihe-ichọ-nma-ya, na nbili-elu ka o doro ya: ma onyinyo di iche iche nke ihe-árú nile ha na nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha ka ha mere nime ya: n'ihi nka ka M'meworo ya ka ọ ghọrọ ha ihe-isọ-nsọ.


nke Ọ gēgosi n'oge nke aka Ya, Onye nání Ya bu Onye di ike, Onye bu kwa onye di ngọzi, bú Eze kachasi ndi bu eze, Onye bu kwa Onye-nwenu kachasi ndi nāchi ka ndi-nwe madu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan