2 Ihe E Mere 2:14 - Bible Nso14 bú nwa nke nwayi nke sitere n'umu-ndinyom Dan, ma nna-ya bu nwoke Taia, ọ bu onye mara ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na nkume, na n'osisi, na n'ogho ododo, na n'ogho anunu, na n'ezi ákwà ọcha, na n'ogho uhie; na ib͕u eb͕ub͕u ọ bula, na ichèputa ihe-nchèputa ọ bula: ka ewe nye ya ọnọdu n'etiti ndi-gi mara ihe, na ndi mara ihe nke onye-nwem, bú Devid nna-gi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a14 Onye nne ya si nʼebo Dan nke dị nʼIzrel, ma nna ya bụ onye Taịa. Ọ bụ onye a zụrụ nʼọrụ ịkpụ ụzụ nke ọma, nʼihe gbasara ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, na nkume, na osisi. Ọ makwa otu e si eji akwa odo odo, na akwa anụnụ anụnụ, na akwa uhie uhie na ezi akwa ọcha arụ ọrụ. Igbunye ụdị akara ọbụla nʼihe nakwa ichepụta ihe ọ ga-eji ihe ọbụla enyere ya mee doro ya anya nke ọma. Ọ ga-esonye ndị ǹka gị, na ndị nke onyenwe m Devid, bụ nna gị. Faic an caibideil |