Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 2:1 - Bible Nso

1 Solomon we si na o gēwuru aha Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Solomọn nyere iwu ka e wuo ụlọ nso ukwu nye Aha Onyenwe anyị, ka e wuokwara ya bụ Solomọn ụlọeze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 2:1
13 Iomraidhean Croise  

Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise ndi nēbu ibu, na orù nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu;


Ma, le, m'nāsi na m'gēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, dika Jehova gwara Devid, bú nnam, okwu, si, Nwa-gi, onye M'gētiyekwasi n'oche-eze-gi n'ọnọdu gi, ya onwe-ya gēwuru aham ulo.


Ma Solomon nọ arọ iri na atọ n'iwu ulo nke aka ya, ọ we wubìe ulo-ya nile.


Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi:


Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m'we bilie n'ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n'oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m'we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo,


O rue, mb͕e Solomon wubìri ulo Jehova, na ulo eze, na ihe nile nke di Solomon ezi nma n'obi nke tọrọ ya utọ ime,


onye ahu gēwuru aham ulo; ya onwe-ya gāburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna; M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike n'elu Israel rue mb͕e ebighi-ebi.


Ha we me ka otù ub͕ọ-ala rigota si n'Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n'ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, na ndi-eze Siria, site n'aka-ha.


Huram we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye mere elu-igwe na uwa, Onye nyeworo Devid, bú eze, nwa-nwoke nke mara ihe, onye mara ezi uche na nghọta, onye gēwuru Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo.


ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:


Kama rue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa n'ebo-unu nile, itiye aha-Ya n'ebe ahu, rue ebe-obibi-Ya ka unu gāchọ, i gābà kwa n'ebe ahu:


Ọ buru na i lezighi anya ime okwu nile nke iwu a nke edeworo n'akwukwọ a, ka i we tua egwu aha nka nke di nsọpuru di kwa egwu, JEHOVA, bú CHINEKE-GI;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan