Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 19:8 - Bible Nso

8 Ọzọ kwa, nime Jerusalem ka Jehoshafat guzoro ufọdu nime ndi Livai na ndi-nchu-àjà, na ufọdu nime ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ikpe ikpe Jehova, na idozi ise-okwu. Ha we laghachi na Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọzọkwa, nʼime Jerusalem, Jehoshafat họpụtara ụfọdụ ndị Livayị, na ndị nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ Izrel ka ha bụrụ ndị na-ahazi iwu nke Onyenwe anyị na-edozikwa esemokwu. Ha bikwa na Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 19:8
11 Iomraidhean Croise  

Nime ndia ndi ọlu-ha bu ichi achi n'ije-ozi ulo Jehova di orú nnù uzọ atọ; nnù ndikom iri-na-ise bu ndi-odozi-okwu na ndi-ikpe:


Nke ndi Izha, Kenania na umu-ya ndikom diri ozi èzí n'ebe Israel nọ, ibu ndi-odozi-okwu na ibu ndi-ikpe.


Ma, le, Amaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, bu onye-isi-unu n'okwu ọ bula nke Jehova; Zebadaia nwa Ishmael, bú onye-ndú ulo Juda, bu onye-isi-unu n'okwu ọ bula nke eze: ndi Livai gābu kwa ndi-odozi-okwu n'iru unu. Dinu ike, me; ka Jehova nọye-kwa-ra ezi madu.


O nye ha iwu, si, Otú a ka unu gēme n'egwu Jehova, na n'ikwesi-ntukwasi-obi, na n'obi zuru okè.


N'ihi na n'ebe ahu ka edoworo oche-eze nile ikpe ikpe, Bú oche-eze nile ulo Devid nwere.


Ọzọ, n'ise-okwu ọ bula ndi ahu gēguzo ikpe ikpe; ikpém nile ka ha gēji kpe ya: ọ bu kwa iwum nile na ukpurum nile nime mb͕em nile akara àkà ka ha gēdebe; ubọchi-izu-ikem nile ka ha gēdo nsọ.


ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n'ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n'aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi:


Mb͕e ise-okwu di n'etiti ndikom, ha we biaru nso ka ewe kpe ikpe, ndi-ikpé we kpe ha; ha gāgu kwa onye ezi omume n'onye ezi omume, gu kwa onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan