Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 19:6 - Bible Nso

6 ọ si ndi-ikpe, Lenu ihe unu onwe-unu nēme: n'ihi na ọ bughi madu ka unu nēkpere ikpe, kama ọ bu Jehova; Ọ nọye-kwa-ra unu n'okwu ikpe-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 19:6
10 Iomraidhean Croise  

Ub͕u a le anya; n'ihi na Jehova arọputawo gi iwu ulo ibu ebe nsọ: di ike, me ya.


Ọ buru na i hu na anēmeb͕u ob͕eye, na anānapu kwa ikpé ziri ezi na ezi omume n'ike n'ala anāchi achi, ibobo anwula gi n'ihe ahu anēme: n'ihi na otù Onye Nke di elu kari onye di elu nāriba ama; ndi di elu di kwa n'elu ha.


Unu emela ajọ omume n'ikpé: ahụla onye nēnweghi ike ikpemara iru ọma, asọpuru-kwa-la iru nke onye uku: n'ezi omume ka i gēkpe madu-ibe-gi ikpe.


O we si ha, Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula: n'ihi na ọ bughi n'ihe ọ nwebigara ókè ka ndu madu di, o sighi n'ihe o nwere puta.


O we si, Lezienu anya ka aghara iduhie unu; n'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Ya; na, Oge ahu di nso: unu esola ha n'azu.


Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nuru ya, ọ jekuru onye-isi-ọchi-agha, kọrọ ya, si, Gini ka i gaje ime? n'ihi na nwoke a bu onye Rom.


O we si ha, Ndikom nke Israel, nēzenu onwe-unu n'ihe banyere madu ndi a, ihe unu gaje ime.


Unu amatala iru madu n'ikpé; unu gānu ikpé onye ntà na ikpé onye uku n'otù uzọ ahu; unu atula iru madu ujọ; n'ihi na ikpé ahu, ọ bu Chineke nwe ya: ma okwu nke sikari unu ike, unu gēweta ya nsom, m'gānu kwa ya.


Nání, lezienu anya nke-ọma ime ihe enyere n'iwu na iwu ahu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na ije íjè n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na irapara n'aru Ya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan