Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 19:10 - Bible Nso

10 Ma mb͕e ise-okwu ọ bula gēru unu nti site n'umu-nne-unu ndi bi n'obodo-ha, n'etiti ọbara na ọbara, n'etiti iwu na ihe enyere n'iwu, na ukpuru na ikpé, unu gēme kwa ka ha ghọta, ka ikpe we ghara ima ha n'ebe Jehova nọ, iwe ewe dikwasi unu, dikwasi kwa umu-nne-unu: otú a ka unu gēme, ikpe agaghi-ama kwa unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe ọbụla ụmụnna unu ndị bi nʼobodo unu dị iche iche buteere unu ikpe igbu mmadụ maọbụ ikpe mmebi iwu ọbụla, maọbụ ihe megidere ihe e nyere nʼiwu, maọbụ nke megidere ụkpụrụ, ma ọ bụkwanụ megide iwu na usoro ime ihe, unu ga-adọ ha aka na ntị ka ha ghara imehie megide Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị unu na ụmụnna unu. Ma ọ bụrụ na unu arụọ ọrụ unu nke ọma, unu agaghị emehie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 19:10
13 Iomraidhean Croise  

Jihu nwa Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, we pua izute ya, ọ si eze, bú Jehoshafat, Ò kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ̀ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n'anya? ma n'ihi ihe a iwe dikwasi gi site n'iru Jehova.


O nye ha iwu, si, Otú a ka unu gēme n'egwu Jehova, na n'ikwesi-ntukwasi-obi, na n'obi zuru okè.


mb͕e ha nwere okwu, ha abiakutem; m'nēkpe kwa ikpe n'etiti madu na ibe-ya, m'nēme kwa ka ha mara ukpuru nile nke Chineke, na iwu-Ya nile.


Nwa nke madu, Onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel: i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.


Ma onye-nche ahu, mb͕e ọ gāhu mma-agha ahu ka ọ nābia, ma ọ fùghi opì-ike, ewe ghara idọ ndi-ya aka na nti, mma-agha ahu abia, wepu madu ọ bula n'etiti ha; onye ahu, n'ihi ajọ omume-ya ka ewepuworo ya, ma n'aka onye-nche ahu ka M'gājuta ọbara-ya.


Moses we si Eron, Were ihe-igu-ọku-gi, tiye ọku n.elu-ya sitere n'elu ebe-ichu-àjà, tukwasi kwa ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, būru ya jekuru nzukọ Israel ngwa ngwa, kpuchiere ha nmehie-ha; n'ihi na iwe ahu esiwo n.iru Jehova puta; ihe-otiti ahu amalitewo.


Moses we me ya: dika Jehova nyere ya iwu, otú a ka ọ mere.


N'ihi ya nēchenu nche, ebe unu chetara na ogologo arọ atọ arapughm iwere anya-miri nādu madu nile n'otù n'otù ọdú abali na ehihie.


ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n'ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n'aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi:


Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan