Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 18:9 - Bible Nso

9 Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n'oche-eze-ya, yiri uwe-ha, ha we nọdu n'ebe-nzọcha-ọka n'oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n'iru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 18:9
12 Iomraidhean Croise  

Zedakaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.


Eze Israel we si Jehoshafat, M'gēnwoghari onwem, ba n'agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya; ha we ba n'agha.


Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ.


Ala-mọ site n'okpuru emeworo gi nkpatu izute gi n'ọbibia-gi: ọ nākpọtere gi ndi nādighi ndu, bú nkpi nile nke uwa; o mewo ka eze nile nke mba nile si n'oche-eze-ha bilie.


Ndi-isi nile nke oké osimiri gēsi n'oche-eze-ha ridata, chizuga uwe-nwuda-ha, ọ bu kwa uwe nile ha akpara nke-ọma ka ha gēyipu: ọma-jijiji nile ka ha gēyibe dika uwe; n'ala ka ha gānọdu, ma jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, ihe-gi gēju kwa ha anya.


Anọm nāhu rue mb͕e atudasari oche-eze di iche iche, otù Onye ochie we nọdu ala: uwe-Ya di ọcha dika snow, agiri-isi nke isi-Ya di kwa ka aji-anu nwupuru enwupu; oche-eze-Ya bu ire ọku ire ọku, wheel-Ya nile bu ọku nēre ere.


Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ǹwoke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n'ulo ndi-eze.


Jisus we si ha, N'ezie asim unu, na unu onwe-unu ndi sorom, n'imu-ọzọ ahu, mb͕e ọ bula Nwa nke madu gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya, unu onwe-unu gānọkwasi kwa n'oche-eze iri na abua, nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.


ma asim unu, na ọbuná Solomon n'ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia.


Ma Boaz rigoro rue ọnu-uzọ-ama, nọdu n>ebe ahu: ma, le, onye-nb͕aputa ahu nke Boaz kwuru okwu bayere ya n=agabiga; ọ kpọ aha-ya, si, Wezuga onwe-gi, nọdu ala n>ebe a. O we wezuga onwe-ya, nọdu ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan