Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 17:6 - Bible Nso

6 Obi-ya di kwa elu n'uzọ nile nke Jehova: ọzọ kwa, o siri na Juda wezuga ebe nile di elu na Asherim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 17:6
16 Iomraidhean Croise  

O jere ije n'uzọ Esa, bú nna-ya; o sighi nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova: nání na ewezugaghi ebe di elu; ndi Israel nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile.


Esa we me ezi ihe nke zi-kwa-ra ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya:


o we wezuga ebe-ichu-àjà nile nke ala ọzọ, na ebe nile di elu, tupia ogidi nile, b͕utue Asherim;


Ma esighi n'Israel wezuga ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n'ubọchi-ya nile.


Otú ọ di, achọtawo ezi ihe n'aka-gi, n'ihi na i mewo ka Asherot si n'ala nka gabiga, i we dozie obi-gi ichọ Chineke.


Nání na ewezugaghi ebe di elu; ma rue ub͕u a ndi Juda edozighi obi-ha nye Chineke nke ndi bu nna-ha.


Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.


N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ, I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova.


Ha gābù kwa abù bayere uzọ nile nke Jehova; N'ihi na ebube Jehova di uku.


kama unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, b͕utu Asherim-ha:


Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N'ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.


si, Gi onye juputara n'aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi?


n'ihi na i fèghi Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè n'ọṅu, na n'obi-utọ, n'ihi iba-uba nke ihe nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan