Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 15:14 - Bible Nso

14 Ha we were oké olu, were kwa iti-nkpu, were kwa opì, were kwa opì-ike, ṅuara Jehova iyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 15:14
9 Iomraidhean Croise  

na ime ka onye ọ bula nwua, ma ọ bu onye ntà ma-ọbu onye uku, ma-ọbu nwoke ma-ọbu nwayi, nke nāchọghi Jehova, bú Chineke Israel.


Juda nile we ṅuria ọṅu n'ọṅuṅu-iyi ahu: n'ihi na ha were obi-ha nile ṅua iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha utọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya: Jehova we me ka ha zuru ike buruburu.


ha nēkekọta onwe-ha n'aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n'ọb͕ub͕a-iyi na n'ọṅuṅu-iyi, ijeghari n'iwu Chineke, nke enyere site n'aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile;


Arurupu-kwa-ram obi-uwem, si, Ka Chineke rurupu nwoke ọ bula otú a site n'ulo-ya, site kwa na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, bú onye nādighi-eme ka okwu a guzosie ike; ọbuná otú a ya bu ihe arurupuworo, nke tọb͕ọ-kwa-ra n'efu. Nkpọkọta ahu nile we si, Amen, ha we to Jehova. Ndi-ayi we me dika okwu a si di.


Chirinu opì na olu opì-ike Tisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova.


Moses we bia, kọrọ ndi Israel okwu Jehova nile, na ikpé-Ya nile; ndi Israel nile we za n'otù olu, si, Okwu nile Jehova kwuworo, ayi gēme ha.


Ọ were akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu, gua ya na nti ndi Israel: ha we si, Ihe nile Jehova kwuworo, ayi gēme ya, nu kwa.


Ndi Israel we si Joshua, Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan