Mọ Chineke we were Zekaraia nwa Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we guzo n'elu n'ebe ndi Juda nọ, si ha, Otù a ka Chineke siri; N'ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe nile Jehova nyere n'iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma? n'ihi na unu arapuwo Jehova, Ọ rapuwo kwa unu.
Ma ndikom abua fọduru n'ọmuma-ulo-ikwū, aha nke otù onye nime ha bu Eldad, aha nke ibe-ya bu Midad: Mọ ahu we bekwasi ha; ha onwe-ha di kwa n'etiti ndi edere aha-ha n'akwukwọ, ma ha apughi jerue Ulo-ikwū ahu: ha we bū amuma n'ọmuma-ulo-ikwū.
Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim.