2 Ihe E Mere 14:7 - Bible Nso7 O we si Juda, Ka ayi wue obodo ndia, were mb͕idi, na ulo-elu, na ibo-ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ b͕a ha buruburu; ala-ayi di n'iru ayi rue ub͕u a, n'ihi na ayi achọwo Jehova, bú Chineke-ayi; ayi achọwo Ya, O we me ka ayi zuru ike buruburu. Ha we wue, ihe we gara ha nke-ọma. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, “Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo.” Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu. Faic an caibideil |
Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.
Amazaia we chikọta Juda, guzo ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nye ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, nye kwa ndi-isi usu ọgu ndikom ise, bú Juda na Benjamin nile: o we gukọta ha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, o we hu na ha di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēji ube na ọta.