Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 14:6 - Bible Nso

6 O we wue obodo ewusiri ike nime Juda: n'ihi na ala di jū, ọ dighi kwa agha o nwere n'arọ ndia; n'ihi na Jehova mere ka o zuru ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 O wuru ọtụtụ obodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nʼala Juda niile. O nweghị onye busoro ya agha, nʼihi na Onyenwe anyị nyere ya udo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 14:6
17 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a Jehova, bú Chinekem, emewo ka m'zuru ike buruburu; ọ dighi onye-nmegide, ọ dighi kwa ihe ọjọ daputara ayi.


Mb͕e ahu ka i gēnwe uche, ọ buru na i lezie anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere Israel: di ike, nwe kwa ume; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.


le, agāmuru gi nwa-nwoke, onye ahu gābu nwoke izu-ike; M'gēme kwa ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu: n'ihi na Solomon ka aha-ya gābu, M'gēnye kwa Israel udo na idi-jū n'ubọchi-ya:


Juda nile we ṅuria ọṅu n'ọṅuṅu-iyi ahu: n'ihi na ha were obi-ha nile ṅua iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha utọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya: Jehova we me ka ha zuru ike buruburu.


kama ọ chọrọ Chineke nke nna-ya, jeghari kwa n'ihe nile O nyere n'iwu, ọ bughi kwa dika omume Israel si di.


Ala-eze Jehoshafat we di jū: n'ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.


O we nọ n'ichọ Chineke n'ubọchi Zekaraia, onye nwere nghọta n'ihu Chineke: ma n'ubọchi ọ nāchọ Jehova, Chineke mere ka ihe gara ya nke-ọma.


Ma n'ọlu ọ bula nke ọ malitere n'òfùfè nke ulo Chineke, na n'iwu, na n'ihe nile enyere n'iwu, ichọ Chineke, ọ bu obi-ya nile ka o ji me ya, ihe we gara ya nke-ọma.


Ma n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ya onwe-ya nọ na nwata, ọ malitere ichọ Chineke nke Devid nna-ya: n'arọ nke-iri-na-abua ka ọ malite-kwa-ra ime Juda na Jerusalem ka ha di ọcha pua n'ebe di elu nile, na Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu.


Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe? Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya? Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:


Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa; Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube; Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku.


O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri site na mb͕e Jehova mere ka Israel zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha nile buruburu, mb͕e Joshua ghọrọ agadi, mb͕e ubọchi ndu-ya nāgwu,


Ala ahu we di jū ọgu arọ abua. Ọtniel nwa Kenaz we nwua.


Ewe me ka Moab ruru ala n'okpuru aka Israel n'ubọchi ahu. Ala ahu we di jū ọgu arọ anọ.


Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova: Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya. Ala we di jū ọgu arọ abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan