Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 13:7 - Bible Nso

7 Ndikom efu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, b͕a onwe-ha ume imegide Rehoboam nwa Solomon, ma Rehoboam bu nwata di kwa nrò n'obi, o meghi kwa onwe-ya ka ọ di ike n'iru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 13:7
20 Iomraidhean Croise  

Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.


me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.


Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.


Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jesi: lanu, nwoke ọ bula, n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel nile we la n'ulo-ikwū-ha.


Eze, bú Rehoboam, we me onwe-ya ka ọ di ike na Jerusalem, o we buru eze: n'ihi na Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri-na-asa na Jerusalem, bú obodo ahu nke Jehova rọputara n'ebo nile nke Israel, ido aha-Ya n'ebe ahu: aha nne-ya bu Neama nwayi Amon.


Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha; Apiapuwo ha n'ala.


Mu na madu efu anọkọghi; Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.


Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.


Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n'ibu-ob͕eye.


Ahuhu gādiri gi, ala, mb͕e eze-gi bu nwata, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe n'ututu!


M'gēwere kwa umu-okoro nye ka ha buru ndi-isi-ha, umu nāṅu ara gāchi kwa ha.


Ma ndi-Ju, ebe ha nēkwo ekworo, ha kuru ajọ ndikom ufọdu nime ndi nēguzo n'efu n'ọma-ahia ka ha so ha, ha we kpọkọta ìgwè madu, me ka obodo ahu tua ùzù; ha we biakwasi ulo Jeson, chọ uzọ ikuputa ha n'iru ọra madu.


Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n'uche-unu: kama burunu umu ọhu n'obi ọjọ, ma n'uche-unu burunu ndi tozuru okè.


Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);


N'ihi na ọtutu madu di ndi nēkweghi idi n'okpuru iwu, ndi nēkwu okwu efu, ndi nāghọb͕u kwa obi madu, ma nke kachasinu ndi si n'etiti ndi obibì-úgwù puta,


N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike.


Jefta we b͕apu n'iru umu-nne-ya, biri n'ala Tob: ndikom efu we chikọta onwe-ha n'ebe Jefta nọ, ha we soro ya pua.


Ha we nye ya ọgu ọla-ọcha atọ na iri sitere n'ulo Beal-berit, nke Abimelek ji go ndikom efu ndi obi-ha nādighi adi n'otù ebe, ha we jeso ya.


Ha we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, bú nwoke ọ bula nke nọ na nkpab͕u, na nwoke ọ bula nke nwere onye ọ nara ego n'ọmuru-nwa, na nwoke ọ bula nkpuru-obi-ya di ilu; o we buru onye-isi-ha: ihe ra ka nnù ndikom we nọ n'aka-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan