Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 13:5 - Bible Nso

5 ọ̀ bughi ọlu-unu imara na Jehova, bú Chineke Israel, nyere Devid ala-eze ibu onye-isi Israel rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná ya na umu-ya, n'ọb͕ub͕a-ndu nnú?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Unu amataghị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel esitela nʼọgbụgba ndụ nnu nyefee ọchịchị ala Izrel niile nʼaka Devid na ụmụ ụmụ ya ruo ebighị ebi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 13:5
24 Iomraidhean Croise  

Joab na ndi soro ya we biarue agha ahu nso imegide Siria: ha we b͕alaga n'iru ya.


Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m'we bilie n'ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n'oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m'we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo,


Ọ gēru kwa, mb͕e ubọchi-gi zuru ijeso nna-gi-hà, na M'gēme ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, onye gēsite n'umu-gi ndikom; M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.


ma M'gēme ka o nēguzo n'ulom na n'ala-ezem rue mb͕e ebighi-ebi: agēme kwa ka oche-eze-ya buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'irum n'inọkwasi n'oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n'iwum dika i jeghariworo n'irum.


M'we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n'egwu Chineke ka unu gējeghari, n'ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi?


N'ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì, Na n'ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara:


ya bu na M'gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M'we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha.


I gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, ndi-nchu-àjà gātusa kwa ha nnú, sure ha ọku, ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.


Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma:


Onyinye ọ bula iji biaru nso nke onyinye-inata-iru-ọma-gi, i gēye kwa ya nnú; eme-kwa-la ka nnú nke ọgbugba-ndu Chineke-gi ghara idi n'onyinye-inata-iru-ọma-gi: n'onyinye-gi nile iji biaru nso ka i gēweta nnú nso.


Àjà-nbuli nile nke ihe nsọ nile, nke umu Israel nēbuliri Jehova, ka M'nyeworo gi, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi: ọb͕ub͕a-ndu nnú ebighi-ebi n'iru Jehova ka ọ buru gi, buru kwa nkpuru-gi tiyere gi.


N'ihi na nka mere ha nchefu n'ihi na ha nāchọ ya, na elu-igwe di site na mb͕e ochie, ha na ala nke esitere na miri were kwa miri me ka o guzokọ n'otù, site n'okwu Chineke;


Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom.


Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n'ihi na nka bu ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan