Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 13:2 - Bible Nso

2 Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Maikaīa nwa-nwayi Uriel nke Gibea. Agha di kwa n'etiti Abaija na Jeroboam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, otu nʼime ụmụ nwanyị Uriel, onye Gibea. Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 13:2
11 Iomraidhean Croise  

Ma ihe nile nke fọduru nke Jeroboam mere, ka o si bu agha, na ka o si buru eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.


Ubọchi nke Jeroboam buru eze we di orú arọ na abua: o we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, Nedab, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.


Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom.


Mb͕e ọ lusiri ya ọ luta-kwa-ra Meaka nwa-nwayi Absalom; o we muara ya Abaija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.


Ma ihe nile Rehoboam mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere nke Shemaia, bú onye-amuma, na n'akwukwọ Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere akwukwọ-osuso-ọmumu? Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.


Abaija we were usu-ndi-agha, bú ndi-dike n'agha, bū agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri, bú ndi arọputara arọputa: ma Jeroboam were orú nnù ndikom ọgu uzọ ise, bú ndi arọputara arọputa, do agha n'usoro imegide ya, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.


na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.


Ha we gabiga, nēje ije-ha; anyanwu we dakpugide ha n'akuku Gibea, nke diri Benjamin.


Ma, le, otù agadi nwoke siri n'ọlu-ya, bú n'ubi, bia n'anyasi; ma nwoke ahu sitere n'ugwu Efraim, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa na Gibea: ma ndikom ebe ahu bu ndi Benjamin.


Sọl we la kwa n'ulo-ya rue Gibea; ndi bu dìnkpà, ndi Chineke meturu obi-ha aka, we jeso ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan