Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 13:18 - Bible Nso

18 Ewe weda umu Israel n'ala na mb͕e ahu, umu Juda we b͕a ume, n'ihi na ha dabere na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ya mere, ntụkwasị obi nke Juda nwere nʼime Onyenwe anyị Chineke nna ha mere ka ha merie Jeroboam na ndị Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 13:18
14 Iomraidhean Croise  

Ọ bu na Jehova, bú Chineke Israel, ka ọ tukwasiri obi; mb͕e ọ nwusiri ọ dighi kwa onye ọzọ di ka ya n'etiti eze nile nke Juda, ma-ọbu n'etiti ndi buru ya uzọ.


Ewe yere ha aka imegide ha, ewe nye ndi Haga na ndi nile ha na ha yikọrọ n'aka-ha: n'ihi na ọ bu Chineke ka ha kpọkuru n'agha ahu, O we kwe ka ha riọta ihe ha riọrọ; n'ihi na ha tukwasiri Ya obi.


Abaija na ndi-ya we tib͕ue ha ọtutu ntib͕u: orú nnù ndi eb͕uru eb͕u ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, we dapu n'Israel.


Abaija we chuso Jeroboam, nara ya obodo, bú Bet-el na umu-obodo-ya, na Jeshana na umu-obodo-ya, na Efron na umu-obodo-ya.


Esa we pua izute ya, ha we do agha n'usoro nime ndagwuruguru Zefata nime Marisha.


Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.


Ha we bilie n'isi-ututu, pua ba n'ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka, Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya:


Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi, Ekwela ka ihere mem; Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum.


Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha.


Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n'ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya.


ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan