Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 13:15 - Bible Nso

15 Ndikom Juda we tie nkpu: o rue, mb͕e ndikom Juda tiri nkpu, na Chineke tib͕uru Jeroboam na Israel nile n'iru Abaija na Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 13:15
16 Iomraidhean Croise  

Ma Neaman, bú onye-isi usu-ndi-agha eze Siria, bu nwoke di uku n'iru onye-nwe-ya, buru kwa onye anāhu iru-ọma, n'ihi na ọ bu n'aka-ya ka Jehova nyere Siria nzọputa: nwoke ahu bu kwa dike nke bu dìnkpà, ma ọ bu onye-ekpenta.


Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.


Jehova we tib͕ue ndi Etiopia n'iru Esa, na n'iru Juda; ndi Etiopia we b͕alaga.


O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, Eze Israel ka ọ bu. Ha we chigharia ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu, Jehova we yere ya aka; Chineke we kpalie ha isi n'ebe ọ nọ pua.


O we me ka ndi-ya dua ya ọdu, o we guzo ndi nābùku Jehova abù, ndi nēto kwa ima-nma nke idi-nsọ, mb͕e ha nāpu n'obodo n'iru ndi ejikere agha, si, Kelenu Jehova; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


Ma na mb͕e ha malitere iti nkpu na ito otuto, Jehova tiyere ndi nēru nbì imegide umu Amon na Moab na ugwu Sia, bu ndi nābakuru Juda; ewe tib͕ue ha.


Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka; Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke.


Chineke ewerewo iti-nkpu rigo, Jehova ewerewo olu opì-ike rigo.


Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


bú ala nke Jehova tib͕uru n'iru nzukọ Israel, ala anu-ulo ka ọ bu, ma ndi-orù-gi nwere anu-ulo.


Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.


O rue, n'ub͕ò nke-asa, mb͕e ndi-nchu-àjà fùru opì-ike asa ahu, na Joshua siri ndi Israel, Tienu nkpu; n'ihi na Jehova enyewo unu obodo ahu.


Ndi Israel we tie nkpu, ndi-nchu-àjà we fùa opì-ike asa ahu: o rue, mb͕e ndi Israel nuru olu opì-ike, na ndi Israel tiri oké nkpu, mb͕idi ahu we da n'okpuru ya, ndi Israel we rigo n'obodo ahu, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya, ha we were obodo ahu.


Jehova we were ọnu mma-agha chusa Sisera, na ub͕ọ-ala-ya nile, na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, n'iru Berak; Sisera we si n'ub͕ọ-ala-ya rida, b͕alaga n'ukwu-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan