Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 13:14 - Bible Nso

14 Juda we le anya n'azu, ma, le, anēbuso ha agha n'iru na azu: ha we tikue Jehova nkpu, ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe ndị agha Juda tụgharịrị hụ na agha dị ha nʼihu dịkwa nʼazụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu nzọpụta, ndị nchụaja fụkwara opi ike ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 13:14
12 Iomraidhean Croise  

Ewe yere ha aka imegide ha, ewe nye ndi Haga na ndi nile ha na ha yikọrọ n'aka-ha: n'ihi na ọ bu Chineke ka ha kpọkuru n'agha ahu, O we kwe ka ha riọta ihe ha riọrọ; n'ihi na ha tukwasiri Ya obi.


Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.


O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, Eze Israel ka ọ bu. Ha we chigharia ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu, Jehova we yere ya aka; Chineke we kpalie ha isi n'ebe ọ nọ pua.


Hezekaia, bú eze, na Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, we kpe ekpere bayere ihe a, we tikue elu-igwe.


Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u; M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.


I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali, Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie;


Fero we biarue nso, umu Israel we welie anya-ha, ma, le, ndi Ijipt nebuli ije n'azu ha; ha we tua egwu nke-uku: umu Israel we tikue Jehova.


Ọzọ, mb͕e unu nēbu agha n'ala-unu megide onye-nkpab͕u nākpab͕u unu, unu gēwere opì me ka ha dasie uda ike; agēcheta kwa unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, agāzọputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu.


O rue, n'ub͕ò nke-asa, mb͕e ndi-nchu-àjà fùru opì-ike asa ahu, na Joshua siri ndi Israel, Tienu nkpu; n'ihi na Jehova enyewo unu obodo ahu.


Ndikom Ai we le anya n'azu ha, hu, ma, le, anwuru-ọku obodo-ha rigoro rue elu-igwe, ike adighi kwa nime ha ib͕alaga otù uzọ ọzọ: ndi Israel ndi nāb͕alaga n'ọzara we chigharia imegide ndi nāchu ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan