Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 13:12 - Bible Nso

12 Ma, le, Chineke nọyere ayi, dika onye-isi-ayi, Ya na ndi-nchu-àjà-Ya, ndi chiri opì ahu, bú nke eji fù ka ha we dasie udà ike, ifù ha ka ha we dasie uda ike megide unu. Umu Israel, unu ebusola Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, agha; n'ihi na ọ gaghi-agara unu nke-ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Chineke nọnyeere anyị. Ọ bụkwa onyendu anyị. Ndị nchụaja ya ga-eji ịfụ opi ike tie mkpu agha megide unu. Unu ndị Izrel, unu alụsokwala Onyenwe anyị bụ Chineke nna unu ha ọgụ nʼihi na mmeri agaghị abụ nke unu!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 13:12
27 Iomraidhean Croise  

Mọ Chineke we were Zekaraia nwa Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we guzo n'elu n'ebe ndi Juda nọ, si ha, Otù a ka Chineke siri; N'ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe nile Jehova nyere n'iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma? n'ihi na unu arapuwo Jehova, Ọ rapuwo kwa unu.


nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.


Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?


O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?


Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah


Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere?


Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n'ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Duritanu onwe-unu ọdu, ma agēmebi ya; kwuenu okwu, ma ọ gaghi-eguzosi ike: n'ihi na Chineke nọyere ayi.


Ọbuná n'ala nka ka i gēsi pua, aka-gi abua adi kwa n'isi-gi: n'ihi na Jehova ajuwo ihe-ntukwasi-obi-gi nile, ọ gaghi-aga-kwa-ra gi nke-ọma nime ha.


Esiworom i ọnyà, ọzọ kwa, amawo gi n'ọnyà ahu, gi Babilon, ma gi onwe-gi amagh: achọtawo gi, ọzọ kwa, ejidewo gi, n'ihi na Jehova ka i lusoworo ọ̀gù.


Si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ bughi nkpọrọgwu-ya nile ka ọ gēropu, bipu kwa nkpuru-ya, ka o we kpọnwua; ka akwukwọ ndu nile nke npute-ya we kpọnwua; ọ̀ gaghi-eji kwa ogwe-aka uku ma-ọbu ndi bara uba iropu ya site na nkpọrọgwu-ya nile?


Ha gādi kwa ka ndi-dike, nāzọda ndi-iro-ha n'apiti èzí nile n'agha; ha gēbu kwa agha, n'ihi na Jehova nọyere ha: ihere gēme kwa ndi nānọkwasi inyinya.


Moses we si, N'ìhi gini kwa ka unu onwe-unu nāgabiga okwu-ọnu Jehova? ma nke ahu agaghi-aga nke-ọma.


O legideghi ajọ ihe anya nime Jekob, Ọ hughi kwa nmeb͕u n'Israel: Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, Iti-nkpu nke eze di kwa n'etiti ha.


Moses we ziga ha, nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula, isoro usu-ndi-agha, ha na Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, isoro usu-ndi-agha, ihe nile nke ebe nsọ Chineke na opì abua ọ gāfù idasi uda ike di kwa n'aka-ya.


ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya.


Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?


n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu.


i gāsọghari kwa ìsì n'etiti ehihie, dika onye-ìsì nāsọghari n'ọchichiri, i gaghi-eme kwa ka ije-gi ọ bula ga nke-ọma: i gābu kwa nání onye anēmeb͕u na onye anānapu ihe-ya n'ike ubọchi nile, onye-nzọputa adighi kwa.


N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan