Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 12:7 - Bible Nso

7 Ma mb͕e Jehova huru na ha wedara onwe-ha n'ala, okwu Jehova ruru Shemaia nti, si, Ha ewedawo onwe-ha n'ala; M'gaghi-ebibi ha: kama M'gēnye ha nb͕apu na mb͕e ntà, agaghi-awusi kwa ọnumam na Jerusalem site n'aka Shaishak.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ otu ha si weda onwe ha nʼala, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Shemaya, sị, “Ebe ọ bụ na ha ewedala onwe ha nʼala, agakwaghị m ebibi ha kama aga m eme ka ha nwe nzọpụta ngwangwa. Agakwaghị m eji Shishak gosi Jerusalem oke iwe m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 12:7
21 Iomraidhean Croise  

Jehova we mere ha amara, nwe obi-ebere n'aru ha, che ha iru, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob mere, O kweghi kwa ibibi ha, O sighi kwa n'iru Ya chupu ha rue ub͕u a.


Ma mb͕e o wedara onwe-ya n'ala, iwe Jehova siri n'aru ya chigharia, O we ghara ibibizu ya: ọzọ kwa, ezi ihe ufọdu di na Juda.


Hezekaia we ruru ala n'ihi idi-elu nke obi-ya, ya onwe-ya na ndi bi na Jerusalem, iwe Jehova abiakwasighi kwa ha n'ubọchi Hezekaia.


Ma mbe anākpab͕u ya, ọ chọ ka iru Jehova, bú Chineke-ya, dajua, we ruru ala nke-uku n'iru Chineke nke nna-ya-hà.


O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n'ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke.


Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi fọduru n'Israel na nime Juda, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke awusaworo ayi, n'ihi na nna-ayi-hà edebeghi okwu Jehova, ime dika ihe nile si di nke edeworo n'akwukwọ a.


n'ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe wusa ọnumam n'ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.


n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Chineke, mb͕e i nuru okwu-Ya nile megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, i we ruru ala n'irum, dọwa kwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha: E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu, Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.


Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.


O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.


Nání mara ajọ omume-gi, na ọ bu Jehova, bú Chineke-gi, ka i jehieworo megide, i we wasara ndi ala ọzọ uzọ-gi nile n'okpuru osisi ndu ọ bula, ma olum ka unu nēgeghi nti, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, iwem na ọnumam ka anāwusi n'ebe a, n'aru madu, na n'aru anu-ulo, na n'aru osisi ọhia, na n'aru nkpuru nke ala-ubi; ọ gēre kwa ọku, agaghi-emenyu kwa ya.


ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan