Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 12:3 - Bible Nso

3 ya na nnù ub͕ọ-ala atọ na orú nnù ndi-inyinya uzọ asa na nnù iri: ndi soro ya si n'Ijipt bia enweghi kwa ọnu-ọgugu; bú ndi-Lubim, na ndi-Sukim, na ndi Etiopia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 O ji otu puku ụgbọ agha na narị abụọ, na ndị agha na-agba ịnyịnya dị puku iri isii, na ndị agha ụkwụ ala, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị agha si Libịa, Sukim na Kush, ndị sooro ya site nʼala Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 12:3
15 Iomraidhean Croise  

Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri-na-ise, na orú nnú ndi-inyinya uzọ ise; o tib͕u-kwa-ra Shobak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, o we nwua n'ebe ahu.


N'ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi.


Jehova we tib͕ue ndi Etiopia n'iru Esa, na n'iru Juda; ndi Etiopia we b͕alaga.


Esa nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu ọta uku na ube, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri ndi sitere na Juda; na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise ndi sitere na Benjamin, bú ndi nēbu ọta, nāzọgide kwa uta ikwe ha: ndia nile bu ndi-dike bu dìnkpà.


Zera, bú onye Etiopia, we chiri usu-ndi-agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ ise, na ọgu ub͕ọ-ala iri-na-ise, pukute ha; o we biarue Marisha.


Ndi Etiopia na ndi-Lubim, hà abughi usu-ndi-agha n'uba, nēnwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya bara uba nke-uku? ma mb͕e i dabere na Jehova, O nyere ha n'aka-gi.


N'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, na Onye Nsọ nke Israel, na onye-nzọputa-gi; enyewom Ijipt ka ọ buru ihe-nb͕aputa-gi, enyewom Etiopia na Seba n'ọnọdu gi.


Etiopia, na Put, na Lud, na ndi nile gwara ọgwa, na Kub, na umu nke ala nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, gēso ha da site na mma-agha.


Ma ọ gēnwe ike n'àkù nile nke ọla-edo na ọla-ọcha, na n'ihe nile anāchọsi ike nke Ijipt: ndi Libia na ndi Etiopia gēso kwa na nzọ-ukwu-ya nile.


Etiopia bu ume-ya, ya na Ijipt, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ya; Put na Lubim buri ndi-iye-aka-gi.


Ọnu-ọgugu usu-ndi-agha ahu, nke bu ndi-inyinya, di ọgu million iri: anurum ọnu-ọgugu-ha.


Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon.


N'ihi na ha na anu-ulo-ha na ulo-ikwū nile ha rigoro, ha batara dika ojuju igurube n'iba-uba; ọnu-ọgugu adighi kwa ha, ọ dighi kwa camel-ha: ha we bata n'ala ibibi ya.


Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan