Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 12:12 - Bible Nso

12 Ma mb͕e o wedara onwe-ya n'ala, iwe Jehova siri n'aru ya chigharia, O we ghara ibibizu ya: ọzọ kwa, ezi ihe ufọdu di na Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mgbe eze wedara onwe ya nʼala, iwe Onyenwe anyị na-eweso ya dajụrụ, Ọ laghịkwa ya nʼiyi kpamkpam. Nʼezie, ezi ihe fọdụkwara na Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 12:12
12 Iomraidhean Croise  

Eleghi anya ọgu ndi ezi omume abua na iri di n'obodo ahu: ọ̀ gābu ezie na i gēkpochapu ebe ahu ghara ib͕aghara ya n'ihi ọgu ndi ezi omume abua na iri nọ nime ya?


Ma Israel nile gētiri ya aka n'obi, lìe ya; n'ihi na onye a, nání ya, nime ndi Jeroboam nwere gābiaru ílì: n'ihi na ahuru nime ya ezi ihe n'ebe Jehova, bú Chineke Israel, nọ, n'ulo Jeroboam.


O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n'ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ biara we būru ha, bughachi kwa ha n'ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ.


Otú ọ di, achọtawo ezi ihe n'aka-gi, n'ihi na i mewo ka Asherot si n'ala nka gabiga, i we dozie obi-gi ichọ Chineke.


N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.


Ma ọ buru na otù uzọ n'uzọ iri afọdu nime ya, aghaghi irechapu kwa ya ọzọ: dika osisi terebinth, na dika osisi oak, nke ogwe fọduru ha mb͕e eb͕utusiri ha; nkpuru nsọ bu ogwe-ya.


O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.


N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru.


Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.


Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan