Joab we ziga ozi na Tekoa, si n'ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n'ihi onye nwuru anwu:
Ha we bilie n'isi-ututu, pua ba n'ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma.
Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.
Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.
Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl.