O nwe-kwa-ra nghọta, we me ka ufọdu nime umu-ya ndikom nile b͕asa rue ala nile nke Juda na Benjamin, rue obodo ọ bula ewusiri ike: o we nye ha nri n'uba. O we chọ ìgwè ndinyom.
Nna-ha we nye ha ọtutu onyinye, nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ihe di oké ọnu-ahia, ha na obodo ewusiri ike nime Juda: ma ala-eze ka o nyere Jehoram, n'ihi na onye ahu bu ọkpara.
mb͕e usu-ndi-agha nke eze Babilon nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo Juda nile fọduru, agha, bú Lekish na Azeka; n'ihi na nání ndia fọduru nime obodo nile nke Juda, bú obodo ewusiri ike.