2 Ihe E Mere 11:16 - Bible Nso16 Site n'ebo nile nke Israel ndi nēnye obi-ha ichọ Jehova, bú Chineke Israel, so-kwa-ra ha bia na Jerusalem ichuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, àjà. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha. Faic an caibideil |
ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:
Otú ọ di, ọ buru na ala ihe-onwunwe-unu arua árú, gabigaranu onwe-unu rue ala ihe-onwunwe Jehova, ebe ebe-obibi Jehova nēbi, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe n'etiti ayi: ma unu anupula isi n'okpuru Jehova, unu anupu-kwa-la isi n'okpuru ayi, n'iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà nābughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi.