Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 11:15 - Bible Nso

15 ọ we guzoro onwe-ya ndi-nchu-àjà idiri ebe di elu, na idiri nkpi, na idiri umu-ehi, nke o mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọ họpụtara ndị nchụaja nke aka ya, maka ebe niile dị elu, nakwa ife arụsị ewu na nwa ehi ndị ahụ ọ kpụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 11:15
16 Iomraidhean Croise  

Eze we me ka adua ya ọdu, o we me umu-ehi abua nke ọla-edo; ọ si ha, Unu arigozuwo Jerusalem; le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


O me ulo nke ebe di elu, me kwa ndi-nchu-àjà sitere n'ọnu-ọgugu ndi Israel nile, ndi nēsiteghi n'umu Livai.


Mb͕e ihe a gasiri, Jeroboam esighi n'uzọ ọjọ ya laghachi, ma o me-kwa-ra ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ọzọ site n'ọnu-ọgugu nile nke ndi Israel: onye ihe-ya nātọ ya utọ, o mejue ya aka, o we ghọ otù nime ndi-nchu-àjà nke ebe di elu.


ma i mewo ihe ọjọ kari ndi nile buru gi uzọ, i we je mere onwe-gi chi ọzọ di iche iche, na arusi a kpuru akpu, ikpasum iwe, i we tufuem n'azu gi:


Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gēme onwe-unu ka unu di ike n'iru ala-eze Jehova n'aka umu Devid; unu onwe-unu bu kwa ìgwè bara uba, n'etiti unu ka umu-ehi ọla-edo di kwa, bú nke Jeroboam mere nye unu ibu chi.


Ùnu akwapughi ndi-nchu-àjà Jehova, bú umu Eron, na ndi Livai, mere onwe-unu ndi-nchu-àjà dika ndi ala ọzọ nēme? onye ọ bula nke nābia iwere nwa oke-ehi na ebulu asa meju aka-ya, ọ gāghọ-kwa-ra ndi nābughi Chineke onye-nchu-àjà.


Moses we jeghachikuru Jehova, si, Biko, ndi nka emehiewo nmehie uku, mere onwe-ha chi ọla-edo.


Ma ub͕u a ha nēmehie kari, we mere onwe-ha arusi apiri api site n'ọla-ọcha-ha, bú arusi di iche iche dika nghọta-ha si di, ọlu nke ndi-ọ̀kà ka ha nile bu: ọ bu bayere ihe ndia ka ha onwe-ha nēkwu okwu, si, Ka ndi nāchu àjà madu sutue umu-ehi ọnu.


Ha agaghi-achu-kwa-ra nkpi àjà-ha ọzọ, nke ha onwe-ha so nākwa iko. Ukpuru ebighi-ebi ka nka gāburu ha rue ọb͕ọ-ha nile.


Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke, Bú chi ha nāmaghi, Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata, Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ.


Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,


n'ihi na ha bu mọ nke ndi-mọ ọjọ, nēme ihe-iriba-ama di iche iche; ndi nāpukuru ndi-eze nke elu-uwa dum madu bi, ime ka ha zukọ ibu agha nke oké ubọchi ahu nke Chineke, Onye puru ime ihe nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan