Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 10:15 - Bible Nso

15 Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Chineke, ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Ọ gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Chineke nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 10:15
20 Iomraidhean Croise  

Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.


Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Jehova, ka O we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Jehova gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo.


Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu, bú umu Israel, agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, laghachi azu n'ulo-ha, dika okwu Jehova si di.


Jehova we si, Ònye gārafu Ehab, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Ọtù onye we si otú a; onye ọzọ si-kwa-ra otú a.


gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na ya: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.


Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, si n'ije imegide Jeroboam laghachi.


Ma o sitere na Chineke, bú nzọda Ehazaia, n'ibiakute Joram: n'ihi na mb͕e ọ biara, o we so Jehoram pukuru Jihu nwa Nimshi, onye Jehova tere manu ibipu ulo Ehab.


Ma ihe nile Solomon mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n'obubu-amuma nke Ahaija, bú onye Shailo, na n'ọhù nile nke Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere Jeroboam nwa Nebat?


Jehova agwakọtawo mọ nke nb͕agọ n'etiti ya: ha we dufue Ijipt n'ọlu-ya nile ọ bula, dika onye ṅubigaworo manya ókè si akpafu n'ihe ọ b͕ọrọ.


Ya mere ha siritara onwe-ha, Ka ayi ghara idọwa ya, kama ka ayi fere ya nzà, onye ọ gābu nke ya: ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezue, nke si, Ha kère uwem nye onwe-ha, N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha fe-kwa-ra nzà. Ya mere ndi-agha ahu mere ihe ndia.


Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:


ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta.


Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n'ala-ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n'aka-gi, otú ọ di ta.


Ma nna-ya na nne-ya amaghi na ọ bu Jehova ka o sitere n'aka; n'ihi na uzọ Ọ gēsi megide ndi Filistia ka ya onwe-ya nāchọ. Ma na mb͕e ahu ndi Filistia nāchi Israel.


Ọ buru na madu emehie megide madu, Chineke gēkpe kwa ya ikpe: ma ọ buru na ọ bu Jehova ka madu nēmehie megide, ònye gēkpere Jehova ekpere bayere ya? Ma ha egeghi nti olu nna-ha, n'ihi na ọ tọrọ Jehova utọ ime ka ha nwua


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan