Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 1:1 - Bible Nso

1 Solomon nwa Devid we me onwe-ya ka ọ di ike n'ala-eze ya, Jehova, bú Chineke-ya, we nọyere ya, me ka ọ di uku ri nne.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Solomọn nwa Devid mere onwe ya ka o guzosie ike nʼalaeze ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ dị ukwuu hie nne.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 1:1
17 Iomraidhean Croise  

O rue na mb͕e ahu, na Abimelek na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, gwara Abraham okwu, si, Chineke nọyere gi n'ihe nile nke gi onwe-gi nēme:


Jehova we nọyere Josef, ọ we buru nwoke ihe nāgara nke-ọma; ọ nọ n'ulo onye-nwe-ya, bú onye Ijipt ahu.


Ma Jehova nọyere Josef, me ka ebere-Ya rue ya aru, O nye ya amara n'iru onye-isi ulo-nkpọrọ ahu.


Onye-nwe-ya we hu na Jehova nọyere ya, ọ hu kwa na ihe nile nke ya nēme, Jehova nēme ka ọ ga nke-ọma n'aka-ya.


Solomon we nọkwasi n'oche-eze Devid nna-ya: ewe me ka ala-eze-ya guzosie ike nke-uku.


Eze we nye Benaia nwa Jehoiada iwu; ọ pua, dakwasi ya, ọ we nwua. Ewe me ka ala-eze guzosie ike n'aka Solomon.


M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.


Ub͕u a, nwam, ka Jehova nọyere gi; gi nwe kwa uche, wue ulo Jehova, bú Chineke-gi, dika O kwuworo bayere gi.


ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, enweghi ọnu-ogugu; bilie, lua ọlu, ka Jehova nọyere kwa gi.


Solomon we nọkwasi n'oche-eze Jehova, buru eze n'ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti.


Jehova we me ka Solomon di uku ri nne n'anya Israel nile, O we tiyekwasi ya ebube ala-eze nke anātukwasighi eze Israel ọ bula nke buru ya uzọ.


tiyere ọbubu-eze-ya nile, na idi-ike-ya, na mb͕e nile nke gabigara n'isi ya, na n'isi Israel, na n'isi ala-eze nile nke ala di iche iche.


Ọtutu madu nēbute-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma, rue Jerusalem, ha nēbute-kwa-ra Hezekaia, bú eze Juda, ihe di oké ọnu-ahia: ewe bulie ya elu n'anya mba nile mb͕e ihe ndia gasiri.


Ọ si, N'ihi na Mu na gi gānọ; nka bu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama na Mu onwem ezigawo gi: mb͕e i gēme-wori ka ndim si n'Ijipt puta, unu gēfè Chineke n'elu ugwu a.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


Jehova we si Joshua, Ta ka M'gāmalite ime ka i di uku n'anya Israel nile, ka ha we mara na otú M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan