ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n'etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n'etiti ha dika ndi nēnye ìhè n'uwa,
Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n'ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n'ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ;