Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.
dika ọ de-kwa-ra n'akwukwọ-ozi-ya nile; nēkwu okwu bayere ihe ndia nime ha; nke ihe ufọdu nke di ike ighọta di nime ha, nke ndi anēzíghi ihe na ndi nādighi-eguzosi ike nāchighari, dika ha nēme kwa ihe fọduru nke edeworo n'akwukwọ nsọ, ila onwe-ha n'iyì.
Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.
Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.