Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Timoti 5:1 - Bible Nso

1 Abarala okenye oké nba, kama nāriọ ya aririọ dika nna; nēmeso kwa umu-okorọbia dika umu-nne:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Abarala okenye mba nʼolu dị ike, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorobịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nʼanya okwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Timoti 5:1
26 Iomraidhean Croise  

I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.


Ma ka aghara ikpọ unu onwe-unu, Rabai: n'ihi na otù Onye bu Onye-ozizí-unu, ma unu onwe-unu nile bu umu-nna.


Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n'otù n'otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n'aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya.


Mb͕e ha ruru Jerusalem, nzukọ Kraist na ndi-ozi na ndi-okenye we nara ha nke-ọma, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me.


Ndi-ozi na ndi-okenye we zukọ ile okwu a.


O we si na Militọs ziga n'Efesọs, kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya.


Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n'ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú; tunu ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru.


Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.


Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya; Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa; Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa; N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi, Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.


Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime okwu Chineke na ozizí.


ndinyom, ndi bu okenye, dika ndi bu nne; umu-ab͕ọghọ dika umu-nne-nwanyi, n'idi-ọcha nile.


si ka agadi-ndikom nwe anya-udo, kwesiri nsọpuru, nwe uche zuru okè, nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi, nime ihu-n'anya, nime ntachi-obi:


otú ahu nāriọ umu-okorọbia ka ha nwe uche zuru okè:


Ma amam-ihe ahu nke si n'elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obi-ọma, nēkweye okwu nke-ọma, juputa n'ebere na ezi nkpuru, nēnweghi obi-abua, nēnweghi iru-abua.


Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nke aru-ya nādighi ike? ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n'isi-ya, nēte ya manu olive n'aha Onye-nwe-ayi:


Ya mere, ariọm ndi-okenye nọ n'etiti unu, onye mu onwem bu okenye-ibe-unu, ya na onye-àmà nke ahuhu nile nke Kraist, abukwam onye-nnwekọ nke ebube ahu nke agaje ikpughe:


Okenye nēdegara nwanyi-nwe-madu, bú onye arọputaworo, akwukwọ, ya na umu-ya, ndi mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu; ọ bughi kwa nání mu onwem, kama ọ bu kwa ndi nile ndi maworo ezi-okwu ahu;


Okenye nēdegara Gaiọs akwukwọ, bú onye ahuru n'anya, onye mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu.


Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m'we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n'oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n'isi-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan