Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Timoti 4:13 - Bible Nso

13 Rue mb͕e m'gābia, nāṅa nti ọgugu-akwukwọ-gi na idu-ọdu-gi na ozizí-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Timoti 4:13
20 Iomraidhean Croise  

Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà;


Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n'obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a.


Ma ayi onwe-ayi gānọgidesi ike n'ekpere-ayi, na n'ije ozi okwu Chineke.


ma-ọbu onye nākasi obi, ya nọ na nkasi-obi-ya: onye nēme ka ndi ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ-ofufo me ya; onye bu onye-isi, ya were obi nānu ọku nābu isi; onye nēme ebere, ya were obi-utọ me ya.


Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n'otù ebe, unu nile n'otù n'otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo.


Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi.


Ma otú ọ di, umu-nnam, asi na agamabiakute unu were asusu di iche iche nēkwu okwu, ùrù gini ka m'gābara unu, asi na agwaghi m unu okwu n'uzọ nkpughe, ma-ọbu n'uzọ ihe-ọmuma, ma-ọbu n'uzọ ibu-amuma, ma-ọbu n'uzọ ozizí?


ọ gādi kwa n'aka-ya, ọ gāgu kwa ihe di nime ya ubọchi nile nke ndu-ya: ka o we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-ya, idebe okwu nile nke iwu a na ukpuru ndia, ime ha:


Riba onwe-gi na ozizí-gi ama. Nānọgide n'ihe ndia; n'ihi na n'ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi.


Ọ buru na i me ka umu-nna-ayi nēchè uche n'ihe ndia, i gābu onye nējere Kraist Jisus ozi nke-ọma, ebe anāzùputa gi n'okwu nile nke okwukwe-ayi, na nke ozizí ọma ahu nke i soworo n'ukwu n'ukwu:


ebe i ma-kwa-ra na i sitere n'oge i di na nwa ọhu mata ihe di nsọ nile edeworo n'akwukwọ nsọ nke puru ime ka i buru onye-amam-ihe inata nzọputa site n'okwukwe nke i kwere na Kraist Jisus.


kwusa okwu-Ya; tukwasi uche n'ọlu-gi n'oge kwesiri, ma-ọbu n'oge nēkwesighi; tu madu nmehie-ha n'anya, ba nba, riọ aririọ, n'ogologo-ntachi-obi nile na ozizí nile.


Nēkwu ihe ndia, were kwa ha nādusi ọdu ike, were kwa ha nātu madu nmehie-ha n'anya, n'inye iwu nile. Ka madu ọ bula ghara ilelì gi anya.


Akwukwọ iwu a agaghi-apu n'ọnu-gi, kama i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezie anya ime dika ihe nile si di nke edeworo nime ya: n'ihi na mb͕e ahu i gēme ka ije-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu i gēnwe kwa uche.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan