Ma ndi nwere ndi kwere ekwe dika ndi-nwe-ha, ka ha ghara ilelì ha anya, n'ihi na ha bu umu-nna-ha; kama ka ha buru orù-ha kari, n'ihi na ndi soro ha ke òkè n'ọlu ọma ha bu ndi kwere ekwe na ndi ahuru n'anya. Nēzí ihe ndia nādu kwa madu ọdú bayere ha.
kwusa okwu-Ya; tukwasi uche n'ọlu-gi n'oge kwesiri, ma-ọbu n'oge nēkwesighi; tu madu nmehie-ha n'anya, ba nba, riọ aririọ, n'ogologo-ntachi-obi nile na ozizí nile.
Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, anamezube kwa ka i kwusie okwu bayere ihe ndia ike, ka ndi kweworo okwu Chineke we tukwasi uche n'ibu ndi-isi n'ọlu ọma. Ihe ndia di nma buru kwa ihe bara madu urù: