O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.
Ihe nke sitere na ndọb͕u nkpuru-obi-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ka ọ gāhu, afọ gēju ya: ihe-ọmuma-ya ka onye ezi omume ahu, bú orùm, gēji me ka ọrà madu ghọ ndi ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe-ya gēbu kwa.
Ge nti, onye ọ bula nke akpiri nākpọ nku, bianu na miri, onye ahu kwa nke nēnweghi ego; bianu, zuru ọka, rie; e, bianu, zuru kwa manya-vine na miri-ara-ehi nējighi ego nārùghi ọnu-ahia.
Ọ̀ nātọm utọ ma-ọli, bú ọnwu nke onye nēmebi iwu? (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ̀ dighi-atọm utọ mb͕e o si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu?
Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?
N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.
Pọl, orù nke Chineke, na onye-ozi nke Jisus Kraist, dika okwukwe ndi Chineke rọputara si di, ya na nmazu nke ezi-okwu ahu nke di n'uzọ nsọpuru-Chineke,
Onye-nwe-ayi anọghi ọdù n'ime nkwa-Ya, dika ufọdu nāgu ya na ọ bu inọ-ọdù; kama Ọ nātachiri unu ogologo-ntachi-obi, n'ihi na O zubeghi ka ndi ọ bula la n'iyì, kama ka madu nile bia rue nchèghari.
Okenye nēdegara nwanyi-nwe-madu, bú onye arọputaworo, akwukwọ, ya na umu-ya, ndi mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu; ọ bughi kwa nání mu onwem, kama ọ bu kwa ndi nile ndi maworo ezi-okwu ahu;
M'we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n'elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula;