13 N'ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv;
13 Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv.
Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.
Jehova, bú Chineke, we si, Ọ dighi nma ka madu ahu nọ nání ya; M'gēmere ya onye-iye-aka kwesiri ya.
ọgiriga ahu, bú nke O weputara n'aru madu ahu, Jehova, bú Chineke, we wue ya dika ulo ka ọ ghọ nwanyi, O me ka ọ biakute madu ahu.
Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu.
Nwayi ahu ka Ọ siri, M'gēme ka ihe-nb͕u-gi na itu-ime-gi ba uba nke-uku; n'ihe-nb͕u ka i gāmu umu; n'ebe di-gi nọ ka ọchichọ-gi gādi, ya onwe-ya gāchi kwa gi.
Madu ahu we kpọ aha nwunye-ya Iv; n'ihi na nwayi ahu bu nne madu nile nwere ndu.