Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 9:3 - Bible Nso

3 Ma nne-inyinya-ibu nile nke Kish, bú nna Sọl, nwere furu efu. Kish we si Sọl nwa-ya, Biko, kuru otù nime ndi-orù tiyere onwe-gi, bilie, je, chọ nne-inyinya-ibum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Otu ụbọchị, ụfọdụ nʼime ịnyịnya ibu Kish nna Sọl nwere kpafuru. Nʼihi ya, Kish kpọrọ Sọl gwa ya okwu sị, “Duru otu odibo ka gị na ya soro ga chọgharịa ịnyịnya ibu ndị a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 9:3
7 Iomraidhean Croise  

Ọ nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ndi orú umu-inyinya-ibu na iri nēbu, ha nwe-kwa-ra orú obodo na iri, nke anākpọ Havot-jaia rue ta, nke di n'ala Gilead.


Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu, Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda, Unu na ndi nēje ije n'uzọ, Tugharinu uche.


Nwa-nne nna Sọl we si ya na nwa-okorọbia-ya, Òle ebe unu jere? Ọ si, Ichọ nne-inyinya-ibu-ayi: ayi we hu na ọ dighi ebe ọ bula ha di, ayi we biakute Samuel.


Mb͕e i siri n'ebe m'nọ la ta, i gāhuta kwa ndikom abua n'akuku ílì Rechel n'ókè-ala Benjamin na Zelza; ha gāsi kwa gi, Achọtawo nne-inyinya-ibu nke i jere ichọ: ma, le, nna-gi arapuwo okwu nne-inyinya-ibu-ya, ọ nēcheb͕u kwa onwe-ya bayere unu, si, Gini ka m'gēme ichọta nwam?


Ọ nwe-kwa-ra nwa-nwoke, aha-ya bu Sọl, ọ bu nwa-okorọbia, ọ ma-kwa-ra nma: ọ dighi kwa nwoke n'etiti umu Israel mara nma kari ya: site n'ubu-ya we rue elu isi-ya ka ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel.


Ma nne-inyinya-ibu-gi nke funariri gi, ta bu ubọchi atọ, atukwasila obi-gi na ha; n'ihi na achọtawo ha. Ma ònye nwere ihe nile anāchọsi ike nke Israel? ọ bughi gi na ulo nile nke nna-gi?


O we gabiga n'ugwu Efraim, gabiga kwa n'ala Shalisha, ma ha achọtaghi ha: ha we gabiga n'ala Shaalim, ma ha adighi n'ebe ahu: o we gabiga n'ala Benjamin, ma ha achọtaghi ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan