Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 9:25 - Bible Nso

25 Ha we si n'ebe di elu ahu rida n'obodo, o we kpayere Sọl uka n'elu-ulo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Mgbe ha sitere nʼebe ahụ dị elu rịdata nʼobodo. Samuel kpanyere Sọl ụka nʼelu ụlọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 9:25
9 Iomraidhean Croise  

O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya.


Ndi ahu we je, chita ha, mere onwe-ha ulo-ntu, nwoke ọ bula n'elu-ulo-ya, na n'ogige nile ha, na n'ogige nile nke ulo Chineke, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama miri, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama Efraim.


ulo nile nke Jerusalem na ulo nile ndi-eze Juda, nke ruru árú, gādi kwa ka ebe Tofet, bú ulo nile nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì uto n'elu-ha nye usu nile nke ihe elu-igwe, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu.


Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo.


onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:


Ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi bubata ya n'ihi ìgwè madu ahu, ha we rigo n'elu ulo, we si n'okpukpu ulo buda ya na ute-ya n'etiti n'iru Jisus.


Ma n'echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n'ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n'elu ulo ikpe ekpere, n'ihe ra ka oge hour nke-isi:


Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.


Ha we bilie n'isi-ututu: o we rue, mb͕e chi bọrọ, na Samuel kpọrọ Sọl n'elu-ulo, si, Bilie, ka m'we zilaga gi. Sọl we bilie, ha abua we pua, ya onwe-ya na Samuel, rue èzí.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan