Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 9:16 - Bible Nso

16 Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Dịka mgbe a echi, aga m ezitere gị otu nwoke sị nʼala Benjamin. Ị ga-ete ya mmanụ nke ga-eme ya ka ọ bụrụ onyendu Izrel ndị m. Ọ ga-azọpụta ha site nʼaka ndị Filistia, nʼihi na ahụla m ahụhụ nke ha nọ nʼime ya; anụkwala m ịkwa akwa ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 9:16
17 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a menu ya: n'ihi na Jehova ekwuwo okwu bayere Devid, si, M'gēwere aka Devid, bú orùm, zọputa ndim, bú Israel, n'aka ndi Filistia, na n'aka ndi-iro-ha nile.


Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nēme ka aru-gi di ike: n'ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova.


Jehova, nuru ekperem, Ka ntikum ru kwa Gi nti.


O we lekwasi ahuhu diri ha anya, Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha:


Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm; Bupu kwa nmehiem nile.


Obi madu nēchè uzọ-ya: Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.


Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n'Anatot, nke di n'ala Benjamin: n'ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M'we mara na okwu Jehova ka nka bu.


Samuel we were karama manu, wukwasi ya n'isi-ya, sutu ya ọnu, si, Ọ̀ bughi na Jehova etewo gi manu ibu onye-ndú ihe-nketa-Ya?


Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n'agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di.


Jehova we zọputa Israel n'ubọchi ahu: agha ahu we gabiga rue Bet-even.


Samuel we si Sọl, Mu ka Jehova zitere ite gi manu ka i buru eze ndi-Ya, bú Israel: ma ub͕u a ge nti olu okwu Jehova.


Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom.


I gākpọ kwa Jesi ibia n'ichu-aja ahu, Mu onwem gēme kwa ka i mara ihe i gēme: i gēte-kwa-ram ya manu, bú onye M'gāsi gi te.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan