Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 7:4 - Bible Nso

4 Umu Israel we wezuga Bealim na Ashtarot, fè nání Jehova òfùfè.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ya mere, ndị Izrel wezugara arụsị Baal na Ashtọret ha, bido ife naanị Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 7:4
11 Iomraidhean Croise  

n'ihi na ha arapuwom, kpọ isi ala nye Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú chi Moab, nye kwa Milkom, bú chi umu Amon; ha ejeghi kwa ije n'uzọm nile, ime ihe ziri ezi n'anyam, na idebe ukpurum nile na ikpém nile, dika Devid, bú nna-ya, mere.


Solomon we jeso Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, jeso kwa Milkom, bú ihe-árú ndi Amon.


ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n'ala ndi-iro-ha, bú ndi dọtara ha n'agha, ha ewe kpere Gi n'uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na ulo nke m'wuworo aha-Gi:


Ọzọ kwa, ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, na ebe di elu nke Jeroboam nwa Nebat mere, bú onye mere ka Israel mehie, ọbuná ebe-ichu-àjà ahu na ebe ahu di elu ka ọ kwaturu; o sure ebe ahu di elu ọku, supia ya me ka ọ ghọ uzuzu, sure kwa Ashera ọku.


Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.


Efraim gāsi, Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ? Mu onwem azawo, M'gēlegide kwa ya anya: mu onwem di ka osisi di ndu; esi nam chọta nkpuru-gi.


Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, fè Bealim òfùfè:


Ha we rapu Jehova, fè Baal na Ashtarot òfùfè.


Samuel we gwa ulo Israel nile okwu, si, Ọ buru na obi-unu nile ka unu onwe-unu nēwere laghachikute Jehova, wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ na Ashtarot n'etiti unu, dozie obi-unu ibiakute Jehova, fè-kwa-nu nání Ya òfùfè: Ọ gānaputa kwa unu n'aka ndi Filistia.


Samuel we si, Chikọtanu Israel nile rue Mizpa, m'gēkpe-kwa-ra Jehova ekpere bayere unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan