15 Samuel we kpe Israel ikpe ubọchi nile nke ndu-ya.
15 Samuel nọgidere dịka onye ikpe ndị Izrel ụbọchị niile nke ndụ ya.
Jehova we me ka ndi-ikpé bilie, ha we zọputa ha n'aka ndi nāpunara ha ihe.
Samuel we si Israel nile, Le, egewom nti olu-unu n'ihe nile nke unu sirim, m'we mere unu eze.
Jehova we zite Jerubeal, na Bedan, na Jefta, na Samuel, we naputa unu n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi.
Samuel we nwua; Israel nile we chikọta onwe-ha, tiere ya aka n'obi, lìe ya n'ulo-ya na Rema. Devid we bilie, rida rue ọzara Peran.
O we nēje buruburu kwa-arọ rue Bet-el, na Gilgal, na Mizpa; o we kpe Israel ikpe n'ebe ahu nile.
Ha we chikọta onwe-ha rue Mizpa, sere miri, wusi ya n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu, kwue n'ebe ahu, si, Ayi emehiewo megide Jehova. Samuel we kpe umu Israel ikpe na Mizpa.