Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 6:3 - Bible Nso

3 Ha we si, Ọ buru na unu ezilaga ib͕e Chineke Israel, ezilagala ya n'aka efu; kama unu aghaghi inyeghachi Ya àjà-ikpe-ọmuma: mb͕e ahu agēme ka aru-unu di ike, agēme kwa ka unu mara ihe mere anēwezugaghi aka-Ya n'aru unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ndị ahụ zara sị, “Ọ bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel, unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 6:3
15 Iomraidhean Croise  

M'gāsi Chineke, Amalam ikpe; Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.


I gēdebe ememe achicha ekoghi-eko: ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib (n'ihi na ọ bu nime ya ka i siri n'Ijipt puta); ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka:


Ma nwa inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya: ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya. Ọkpara ọ bula n'etiti umu-gi ka i gāb͕aputa. Ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka.


Fero we hu na o bìwo, o we me ka obi-ya di arọ́, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.


ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, bú nne nke si n'ìgwè ewu na aturu puta, nwa-aturu ma-ọbu nwa-ewu, ka ọ buru àjà-nmehie; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu.


Ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè sitere n'ìgwè ewu na aturu, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ọ gēwetara onye-nchu-àjà:


Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa; n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu: agaghi-ahu kwa ha n'iru Jehova n'aka efu:


Ha we ziga, chikọta ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Zilaga ib͕e Chineke Israel, ka ọ laghachi kwa n'ebe-ya, ka o we ghara ime ka ayi na ndi-ayi nwua: n'ihi na ọb͕ub͕a-aghara nke ọnwu di n'obodo ahu nile; ọ di arọ́ nke-uku, bú aka Chineke, n'ebe ahu.


Ndikom Ashdod we hu na ọ di otú a, ha we si, Ib͕e Chineke Israel agaghi-anọgide n'etiti ayi: n'ihi na aka-Ya esikawo ike n'aru ayi na n'aru Degon, bú chi-ayi.


O rue, mb͕e ha būsiri ya buruburu, na aka Jehova digidere obodo ahu n'ọb͕ub͕a-aghara di uku ri nne: Ọ we tib͕ue ndikom obodo ahu, site n'onye ntà we rue onye uku, emerod we b͕apue n'aru ha.


were-kwa-nu ib͕e Jehova tiyekwasi ya n'ub͕ọ-ala ahu; tiye ihe ọla-edo ahu, nke unu nēnyeghachi Ya ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, n'ib͕e ntà n'akuku-ya; zilaga-kwa-nu ya, ka ọ we la.


Le-kwa-nu, ọ buru na ọ rigo n'uzọ ókè-ala-ya rue Bet-shemesh, Ya onwe-ya emewo ayi oké ihe ọjọ a: ma ọ buru na ọ rigoghi otú a, ayi gāma kwa na ọ bughi aka-Ya tib͕uru ayi; ihe-ndabà ka ihe ahu bu, nke dabara ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan