Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 6:14 - Bible Nso

14 Ub͕ọ-ala ahu we ba n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, guzo n'ebe ahu, nkume uku di kwa n'ebe ahu: ha we kpọwa osisi ub͕ọ-ala ahu, sure ehi abua ahu ọku ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe ụgbọala ahụ batara nʼubi nwoke a na-akpọ Joshua na Bet-Shemesh, ọ kwụsịrị nʼakụkụ otu nkume ukwu dị nʼebe ahụ. Ngwangwa, ndị nọ nʼebe ahụ gbuwasịrị osisi e ji mee ụgbọ ahụ, gbukwaa ehi abụọ ahụ, were ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 6:14
13 Iomraidhean Croise  

Gad we biakute Devid n'ubochi ahu, si ya, Rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.


Arọna we si Devid, Ka onye-nwem, bú eze were ihe di nma n'anya-ya sure ọku, le, ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka nile na ihe ehi nile ka ha buru nkú:


Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo. Ewe riọta Jehova aririo bayere ala ahu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu n'ebe Israel nọ.


O we si n'iso ya laghachi, were ehi abua ahu ejikọrọ n'otù, b͕ue ha, o were kwa ihe ehi ahu ji alu ọlu sie anu-ha, o nye ndi ahu, ha rie. O bilie, jeso Elaija, we jere ya ozi.


Ebe-ichu-àjà nke ájá ka i gēmerem, chu kwa àjà-nsure-ọku-gi nile na àjà-udo-gi nile n'elu ya, bú ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi: n'ebe nile ọ bula ebe M'nēme ka echeta aham, n'ebe ahu ka M'gābiakute gi, gọzi kwa gi.


O rue, n'echi-ya, na ndi Israel biliri n'isi-ututu, wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo.


wu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'elu ebe a siri ike, n'usoro, were kwa oke-ehi nke-abua ahu, were kwa nkù Ashera nke i gēb͕utu, sure àjà-nsure-ọku.


Ma, le, Sọl biara, nēso ìgwè ehi si n'ubi; Sọl we si, Gini nēme ndi Israel na ha nākwa ákwá? Ha we kọrọ ya okwu nile nke ndikom Jebesh.


ọ si, Biko, zilagam; n'ihi na àjà ab͕uru-ayi ka ayi nwere n'obodo; ya onwe-ya enyewom iwu, bú nwa-nnem, ije: ma ub͕u a, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, ka m'wepuga onwem, we hu umu-nnem. N'ihi ya ọ biaghi na table eze.


Ma ndi Bet-shemesh nēbì ọka wheat-ha na ndagwurugwu: ha we welie anya-ha, hu ib͕e ahu, ṅuria ọṅu ihu ya.


òké ọla-edo kwa, dika ọnu-ọgugu obodo nile nke ndi Filistia si di, bú nke ndi-isi ise ahu nwere, site n'obodo ewusiri ike we rue obodo ntà nke nēnweghi mb͕idi: we rue nkume uku ahu, bú Ebel, nke ha dọbara ib͕e Jehova n'elu ya: ọ di n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan