Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 4:21 - Bible Nso

21 O we kpọ aha nwa ahu Ikabod, si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua: n'ihi owuwe ewere ib͕e Chineke, na n'ihi nna di-ya na di-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ọ gụrụ nwantakịrị aha, kpọọ ya Ịkabọdụ, kwuo sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ,” nʼihi obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, na nʼihi ọnwụ nna di ya na di ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 4:21
12 Iomraidhean Croise  

Ha we b͕anwe nsọpuru-ha N'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala.


Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya, Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.


O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha, Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u.


Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha; Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.


Ọ̀ di mba ab͕anweworo chi di iche iche ha, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? ma ndim ab͕anwewo nsọpuru-ha n'ihe nadighi-abà urù.


Le, ka Onye-nwe-ayi si were igwe-oji kpuchie ada Zaion n'iwe-Ya! O siwo n'elu-igwe tuda ima-nma nke Israel n'ala, Ọ chetaghi kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya n'ubọchi iwe-Ya.


E, ọ buru na ha azulite umu-ha, ma M'gāb͕aba ha aka nwa, madu ọ bula ewe ghara idi: e, ahuhu di-kwa-ra ha mb͕e M'gēsi n'aru ha wezuga Onwem!


Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo.


Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama, nke gābiakwasi umu-gi abua, bú Họfnai na Finehas; n'otù ubọchi ka ha abua gānwu.


N'ubọchi ahu M'gēme ka okwu nile M'kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu.


Ewe were ib͕e Chineke; umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nwukwara.


O we si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua; n'ihi na ewerewo ib͕e Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan