Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 4:10 - Bible Nso

10 Ndi Filistia we bu agha, ewe tib͕ue Israel, ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya: oké ntib͕u uku we di; orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise, bú ndi ji ukwu eje, we dapu n'Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ndị Filistia lụrụ ọgụ dịka dike, lụgbuo ndị Izrel. Ndị agha ji ụkwụ eje ọgụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Ma ndị fọdụrụ gbalara nʼụlọ ikwu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 4:10
19 Iomraidhean Croise  

Ha we were Absalom, tubà ya n'olùlù uku n'oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n'elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya


Ewe tib͕ue ndi Israel n'ebe ahu n'iru ndi-orù Devid, ntib͕u uku we di n'ebe ahu n'ubọchi ahu, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri.


Eze we bilie, nọdu n'ọnu-uzọ-ama. Ha we gosi ndi ya nile, si, Le, eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama: ndi ahu nile we bia n'iru eze. Ma Israel b͕alagara, nwoke o bula n'ulo-ikwū-ya.


Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel.


Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jese: lanu n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel we la n'ulo-ikwū-ha.


Iti-nkpu we gazue n'ọmuma-ulo-ikwū mb͕e anyanwu nāda, si, Nwoke ọ bula, ya la n'obodo-ya, nwoke ọ bula, ya la n'ala-ya.


Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya.


Abaija na ndi-ya we tib͕ue ha ọtutu ntib͕u: orú nnù ndi eb͕uru eb͕u ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, we dapu n'Israel.


Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya.


Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta, Ma ha chighariri n'ubọchi agha.


Otú ọ di, biko, jeruenu ọnọdum nke di na Shailo, ebe M'mere ka aham biri na mbu, hunu ihe M'mere ya n'ihi ihe ọjọ nke ndim, bú Israel.


M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.


Ma ọ gēru, ọ buru na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta; na nkọcha nile ndia gābiakwasi gi, we rue gi aru.


Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


Jehova we si Samuel, Le, Mu onwem nēme ihe n'Israel, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.


Ndi Filistia we do onwe-ha n'usoro izute Israel: agha ahu we nọsa, ewe tib͕ue Israel n'iru ndi Filistia: ha we tib͕ue n'etiti usoro ndi-agha Israel n'ọhia ihe ra ka nnù ndikom iri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan