Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 31:6 - Bible Nso

6 Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ na onye nēbu ihe-agha-ya na ndikom-ya nile n'otù, n'ubọchi ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ, onye na-ebu ihe agha ya na ndị agha ya niile, nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 31:6
14 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua;


Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha.


Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ; ulo-ya nile nwu-kwa-ra n'otù.


O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m'nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua.


Ndi Israel nile we jerue Gilgal; ha we me Sọl eze n'ebe ahu n'iru Jehova nime Gilgal; ha we chua ihe àjà nke àjà-udo n'iru Jehova n'ebe ahu. Sọl na ndikom nile nke Israel we ṅuria ọṅu nke-uku n'ebe ahu.


Ọ̀ bughi obìbì ọka wheat ta? M'gākpọku Jehova, Ọ gēnye kwa éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo; mara-kwa-nu hu kwa na ihe ọjọ unu riri nne, nke unu meworo n'anya Jehova, n'iriọrọ onwe-unu eze.


Ma ọ buru na unu eme ihe ọjọ nāga n'iru, agēkpochapu unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu.


Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n'agha, ewe kpochapu ya.


Ọzọ kwa, Jehova gēnye Israel n'aka ndi Filistia tiyere gi: echi ka gi na umu-gi ndikom gānọye-kwa-ram: Jehova gēnye kwa ọmuma-ulo-ikwū Israel n'aka ndi Filistia.


Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, soro ya nwua.


Ndikom Israel ndi nọ n'ofè ọzọ ndagwurugwu ahu, na ndi nọ n'ofè Jọdan, we hu na ndikom Israel ab͕alagawo, hu kwa na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo, ha we rapu obodo nile ha, b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan