Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 31:12 - Bible Nso

12 ndikom nile bú dìnkpà we bilie, je ije ogologo abali ahu nile, si na mb͕idi Bet-shan buru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom; ha we biarue Jebesh, sure ha ọku n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, gara njem ogologo abalị ahụ niile jeruo Bet-Shan. Ha sitere nʼelu mgbidi obodo Bet-Shan tọda ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom buru ha laa Jebesh ebe ha nọ kpọọ ozu ha ọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 31:12
6 Iomraidhean Croise  

ndikom nile bu dìnkpà we bilie, būru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom, bubata ha na Jebesh, lìe ọkpukpu-ha n'okpuru osisi terebinth nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.


Ha we lìe ya n'ili ya, nke o gwuwara nye onwe-ya n'obodo Devid, ha we me ka o dina n'ihe-ndina nke emejuru n'uda di iche iche na ihe di iche iche asugwara asugwa n'ọlu onye nāsugwa manu nēsì ísì utọ: ha we surere ya oké nsure-ọku di uku.


n'udo ka i gānwu; ọzọ, nsure nile nke nna-gi-hà, bú ndi-eze mbu, ndi buru gi uzọ, otú a ka ha gēsurere gi ihe; ọzọ, Éwù, onye-nwe-ayi! ka ha gāsi n'itiri gi aka n'obi; n'ihi na okwu ka Mu onwem kwuworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma mb͕e nwa-nne nna madu, bú onye-nsure-ọku-ya, gēburu ya ichipu ọkpukpu n'ulo, si onye nke nọ n'ime-ime-ulo nke ulo ahu, Ọ̀ di onye ọzọ gi na ya nọ? ọ gāsi, É-è; si kwa, Nọdu du; n'ihi na ayi agaghi-ehota aha Jehova.


Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo Ashtarot: ma ha kpọgidere ozu-ya na mb͕idi Bet-shan.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan